Job 12

Okwu Job

1Mgbe ahụ, Job zara:

2“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe,
unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.
3Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu;
abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ.
Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?

4“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ,
nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za,
onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!
5Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya
dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.
6Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ;
ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo,
bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.

7“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị,
maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.
8Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị,
maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.
9Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị
na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?
10Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị,
ya na ndụ ụmụ mmadụ
11Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu,
otu ire si anwale ihe oriri?
12Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye?
Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?

13“Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike,
ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.
14Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ;
mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.
15Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa.
Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.
16Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị;
ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.
17Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha,
ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.
18Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere,
ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.
Ndị ohu a dọtara nʼagha bụ naanị akwa mgbochi a na-eke nʼukwu ka ha na-eyi.

19Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha,
kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.
20Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi,
wepụkwa nghọta nke ndị okenye.
21Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị,
napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.
22Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị
meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.
23Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi;
Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.
24Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha,
zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.
25Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè.
Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.
Copyright information for IboBIU